A na-etinyere onye nze egoọjị n'ọkwa Ọjị maka ịsọpụrụ ya n'echichi ya. Ose ọji e gwere egwe, aku ilu, ose ọji, mmịmi. A na-atụpụrụ onye ọbịa nzu iji sị ya udo dịrị gị. A na-enye nwanyị ọjị n'aka, maọbụ kwe ka o were n'Ọkwa Ọjị oge nwoke niile wechaara. Nwanyị adịghị etinye aka n'ọkwa Ọjị, maọbụ were Ọjị tupu nwoke. Nwanyị adịghị awa Ọjị n'ala Igbo, ebe nwoke nọ. O nweziri ike nye onye bụ nwata ka o kee Ọjị ebe ahụ. Ụfọdụ na-awa Ọjị n'onye bụkarịsịrị nwata onye bụkarịsịrị okenye bụ onye ga-agọ ya bụ Ọjị. Akuku ala Igbo dị iche iche nwere usoro ha si ago Oji. Onye Igbo agọghi Ọji agọ were taa ya amaghị ihe ọ na-eme. Nke gbara asaa, a na-egburu ya ọkụkọ, maọbụ kwanyere ya ugwu pụrụ iche. Ọjị Igbo na-agba site na ibe atọ were rute ibe asaa. Mana nke na-acha nzu nzu na adanyekwa oge ụfọdụ. Oji Igbo na-adị iche n'oji nke ọzọ a na-akpọ ọjị gworo ya bụ ọjị awụsa nke na-agba sọ ibe abụọ, na-acha ọcha. Ọjị na-adịkarị n'uju ọdịda anyanwụ Naijiria, nke a na-akpọ South West ya bụ ala ndị Yoruba. Ọ na-epukwara onwe ya dịka mkpụrụ osisi ndị ọzọ. Ọjị bụ mkpụrụ osisi na-amị n'ụlọ na-amịkwa n'ọhịa. Ma na ka anyi na awa, ma na atakwa ya bu Oji, o ga adi mma ka anyi kpaa ihe ole na ole banyere ya.
0 Comments
Leave a Reply. |